Diuteronomi 34:2
Deuteronomy 34:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.*
Deuteronomy 34:2 in English
Deuteronomy 34:2 · Berean Standard Bible
all of Naphtali, the land of Ephraim and Manasseh, all the land of Judah as far as the Western Sea,*
Context
1Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan; 2ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.* 3Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa. 4Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’* Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.