Diuteronomi 31:11
Deuteronomy 31:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe Izrel niile ga-abịa nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta, ị ga-agụpụta ihe a site nʼakwụkwọ iwu a nʼihu mmadụ niile ka ha nụrụ ya.
Deuteronomy 31:11 in English
Deuteronomy 31:11 · Berean Standard Bible
when all Israel comes before the LORD your God at the place He will choose, you are to read this law in the hearing of all Israel.
Context
9Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile. 10Mgbe ahụ, Mosis nyere ha iwu sị, “Na ngwụcha afọ asaa ọbụla, nʼafọ ahụ a na-akagbu ụgwọ niile, nʼoge a na-eme Mmemme ụlọ Ikwu, 11mgbe Izrel niile ga-abịa nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta, ị ga-agụpụta ihe a site nʼakwụkwọ iwu a nʼihu mmadụ niile ka ha nụrụ ya. 12Kpọkọta mmadụ niile nʼotu ebe, ndị ikom, na ndị inyom na ụmụntakịrị,* na ndị ọbịa bi nʼetiti obodo unu, ka ha nụrụ, ma mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu na ilezi anya ịgbaso okwu niile dị nʼiwu a. 13Ụmụntakịrị ha, ndị na-amabeghị iwu ndị a, aghaghị ịnụ na ịmụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, ụbọchị ndụ unu niile nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.