Diuteronomi 30:5
Deuteronomy 30:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha.
Deuteronomy 30:5 in English
Deuteronomy 30:5 · Berean Standard Bible
And the LORD your God will bring you into the land your fathers possessed, and you will take possession of it. He will cause you to prosper and multiply more than your fathers.
Context
3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu. 4A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu. 5Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha. 6Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ. 7Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka ọbụbụ ọnụ ndị a bịakwasị ndị iro unu, ndị kpọrọ unu asị na ndị na-akpagbu unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.