Diuteronomi 30:16
Deuteronomy 30:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta.
Deuteronomy 30:16 in English
Deuteronomy 30:16 · Berean Standard Bible
For I am commanding you today to love the LORD your God, to walk in His ways, and to keep His commandments, statutes, and ordinances, so that you may live and increase, and the LORD your God may bless you in the land that you are entering to possess.
Context
14Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha. 15Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi. 16Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta. 17Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha, 18agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.