Diuteronomi 3:15
Deuteronomy 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Makia ka m nyere Gilead.
Deuteronomy 3:15 in English
Deuteronomy 3:15 · Berean Standard Bible
To Machir I gave Gilead,
Context
13Ala fọdụrụ na Gilead nakwa Bashan niile na alaeze Ọg ka m nyere otu ọkara ebo Manase. Nke a bụ ala Agob niile dị na Bashan, bụ ndị amaara dịka ala ndị Refaim. 14Jaịa, onye si nʼebo Manase, were ala niile dị nʼAgob, ọ bụladị ruo nʼoke ala ndị Geshua na ndị Maaka. Ọ kpọrọ ya nʼaha ya, nke mere na ruo taa ihe a na-akpọ Bashan bụ Havọt Jaịa, nke pụtara, obodo Jaịa. 15Makia ka m nyere Gilead. 16Ma Ebo Ruben na Gad ka m nyere ala niile dị site na Gilead ruo nʼetiti ndagwurugwu Anọn, na site na ndagwurugwu a ruo nʼiyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Etiti ndagwurugwu Anọn bụkwa oke ala ebo Ruben na Gad. 17Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ osimiri Jọdan nke dị nʼAraba. Oke ala a sitere na Kineret gbatịa ruo nʼOsimiri Araba (ya bụ Osimiri Nnu), nke dị na mgbada ugwu Pisga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.