Diuteronomi 29:21
Deuteronomy 29:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti ya na ebo niile nke Izrel, maka iwetara ya mbibi, dị ka ọbụbụ ọnụ niile nke ọgbụgba ndụ nke e dere nʼime Akwụkwọ Iwu a si dị.
Deuteronomy 29:21 in English
Deuteronomy 29:21 · Berean Standard Bible
and single him out from all the tribes of Israel for disaster, according to all the curses of the covenant written in this Book of the Law.
Context
19Mgbe onye dị otu a nụrụ okwu ịṅụ iyi a, na ha ga-agọzi onwe ha, na-eche, “Ihe ga-agara m nke ọma, ọ bụ ezie na m nọgidere na-agbaso ụzọ isiike m.” Ha ga-eweta mbibi nye ala a gbara mmiri nke ọma nyekwa ala ahụ kpọrọ nkụ. 20Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agbaghara onye dị otu a! Iwe ya, na ekworo ya, ga-adị ọkụ megide nwoke ahụ. Ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a ga-abịakwasịkwa ya. Onyenwe anyị ga-ehichapụkwa aha ya, ka a ghara ịnụkwa ihe banyere ya nʼụwa. 21Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti ya na ebo niile nke Izrel, maka iwetara ya mbibi, dị ka ọbụbụ ọnụ niile nke ọgbụgba ndụ nke e dere nʼime Akwụkwọ Iwu a si dị. 22Mgbe ahụ, ụmụ unu ndị ga-eso unu nʼọgbọ ndị dị nʼihu, na ndị ọbịa si ebe dị anya bịa, ga-ahụ oke ihe otiti ọjọọ a bịakwasịrị ala a, ya na ọrịa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. 23Ala ahụ niile ga-abụ ala nnu, nke ọkụ repịara, ala nke a na-adịghị akụ ihe ọbụla nʼime ya, ala na-adịghị amị mkpụrụ, nke ahịhịa na-adịghị epu nʼelu ya. Ala dịka ala Sọdọm na Gọmọra, na Adma, na Zeboiim, nke Onyenwe anyị sitere nʼoke iwe ya mebie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.