Native Bible

Deuteronomy 29:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu guzo nʼebe a taa ka unu na Onyenwe anyị Chineke gbaa ndụ. Unu guzokwa, maka ọgbụgba ndụ a unu na Onyenwe anyị na-agba taa, nke e ji ịṅụ iyi mesie ike,

Deuteronomy 29:12 in English

Deuteronomy 29:12 · Berean Standard Bible

so that you may enter into the covenant of the LORD your God, which He is making with you today, and into His oath,

Context

10Unu niile, ndị ndu unu, na ndịisi unu, na okenye, na ndịisi ọchịchị, na ndị ikom niile nke Izrel, unu ndị guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke taa, 11na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.* 12Unu guzo nʼebe a taa ka unu na Onyenwe anyị Chineke gbaa ndụ. Unu guzokwa, maka ọgbụgba ndụ a unu na Onyenwe anyị na-agba taa, nke e ji ịṅụ iyi mesie ike, 13ime ka ọ pụta ìhè nye unu taa na unu bụ ndị nke ya, imekwa ka unu mata na ọ bụ Chineke unu, dịka o kwere nna nna unu ha, Ebraham, na Aịzik, na Jekọb na nkwa. 14Ọgbụgba ndụ a nke ya na ịṅụ iyi so nke m na-eme ka ọ dịrị abụghị naanị nʼihi unu,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.