Native Bible

Deuteronomy 28:67 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụtụtụ, ị ga-asị, “Ewoo, a sịkwa na ugbu a bụ uhuruchi!” Nʼuhuruchi ị ga-asịkwa, “Ewoo, a sịkwarị na ugbu a bụ ụtụtụ!” Ị ga-ekwu ihe ndị a nʼihi ihe egwu juru gị obi, na nʼihi ihe ndị ahụ niile anya gị na-ahụ.

Deuteronomy 28:67 in English

Deuteronomy 28:67 · Berean Standard Bible

In the morning you will say, ‘If only it were evening!’ and in the evening you will say, ‘If only it were morning!’—because of the dread in your hearts of the terrifying sights you will see.

Context

65Nʼetiti mba ndị a, obi agaghị eru gị ala, ọbụ ụkwụ gị agaghị enwe ebe izuike. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị ga-enye gị mkpụrụobi na-ama jijiji, anya nke ike gwụrụ nʼihi enweghị olileanya, na obi na-ada mba. 66Ndụ gị ga-ekonye nʼelu nʼihi oke egwu. Ị ga-anọ nʼegwu, ehihie na abalị, ị gaghị ejikwa ndụ gị nʼaka. 67Nʼụtụtụ, ị ga-asị, “Ewoo, a sịkwa na ugbu a bụ uhuruchi!” Nʼuhuruchi ị ga-asịkwa, “Ewoo, a sịkwarị na ugbu a bụ ụtụtụ!” Ị ga-ekwu ihe ndị a nʼihi ihe egwu juru gị obi, na nʼihi ihe ndị ahụ niile anya gị na-ahụ. 68Onyenwe anyị ga-eme ka i soro ụgbọ mmiri lọghachi nʼIjipt, nʼije ahụ m kwuru na ị gaghị ejekwa ọzọ. Nʼebe ahụ ị ga-ewere onwe gị resi ndị iro gị dịka ohu ndị ikom maọbụ ndị inyom, ma ọ dịghị onye ga-achọ ịzụ gị. 28:11 Dit 30:9

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.