Diuteronomi 28:30
Deuteronomy 28:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị na nwanyị ga-enwe nkwekọrịta ịlụ di na nwunye, ma nwoke ọzọ ga-eduru ya dinaa ya nʼike. Ị ga-ewu ụlọ ma ị gaghị ebi nʼime ya. Ị ga-akụ ubi vaịnị ma ị gaghị eri mkpụrụ si na ya.
Deuteronomy 28:30 in English
Deuteronomy 28:30 · Berean Standard Bible
You will be pledged in marriage to a woman, but another man will violate her. You will build a house but will not live in it. You will plant a vineyard but will not enjoy its fruit.
Context
28Onyenwe anyị ga-ezitere gị isi mgbaka, na ikpu ìsì, na ọgbaaghara nke obi. 29Ị ga-asọgharị isi nʼetiti ehihie dịka onye kpuru ìsì nʼasọgharị nʼọchịchịrị. Ọ dịghị ihe ọbụla ga-agara gị nke ọma. Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ị ga-abụ onye a na-emegbu emegbu, na onye a na-anapụ ihe ya nʼike oge niile, na-enweghị onye ga-anapụta gị. 30Gị na nwanyị ga-enwe nkwekọrịta ịlụ di na nwunye, ma nwoke ọzọ ga-eduru ya dinaa ya nʼike. Ị ga-ewu ụlọ ma ị gaghị ebi nʼime ya. Ị ga-akụ ubi vaịnị ma ị gaghị eri mkpụrụ si na ya. 31Nʼihu anya gị ka a ga-egbu ehi gị, ma ị gaghị ata iberibe anụ ya. A ga-anapụ gị ịnyịnya ibu gị nʼihu anya gị ma a gaghị eweghachiri gị ya. Atụrụ gị ka a ga-enye ndị iro gị. Ọ dịkwaghị onye ga-anapụta ha. 32A ga-ewere ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nye ndị mba ọzọ. Ọ ga-agụ gị agụụ ogologo oge ka ị hụ ha anya, ma ị pụghị inyere ha aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.