Native Bible

Deuteronomy 28:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha Onyenwe anyị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu.

Deuteronomy 28:10 in English

Deuteronomy 28:10 · Berean Standard Bible

Then all the peoples of the earth will see that you are called by the name of the LORD, and they will stand in awe of you.

Context

8Onyenwe anyị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị. 9Onyenwe anyị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile. 10Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha Onyenwe anyị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu. 11*Onyenwe anyị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị. 12Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.