Diuteronomi 27:23
Deuteronomy 27:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Deuteronomy 27:23 in English
Deuteronomy 27:23 · Berean Standard Bible
‘Cursed is he who sleeps with his mother-in-law.’ And let all the people say, ‘Amen!’
Context
21“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.”
Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 22“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.”
Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 23“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.”
Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 24“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.”
Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 25“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.