Native Bible

Deuteronomy 27:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha.

Deuteronomy 27:2 in English

Deuteronomy 27:2 · Berean Standard Bible

And on the day you cross the Jordan into the land that the LORD your God is giving you, set up large stones and coat them with plaster.

Context

1Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa. 2Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha. 3Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke Onyenwe anyị Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị. 4Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.