Native Bible

Deuteronomy 26:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha.

Deuteronomy 26:12 in English

Deuteronomy 26:12 · Berean Standard Bible

When you have finished laying aside a tenth of all your produce in the third year, the year of the tithe, you are to give it to the Levite, the foreigner, the fatherless, and the widow, that they may eat and be filled within your gates.

Context

10Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị, lee, ewebatala m mkpụrụ mbụ sitere nʼala i nyere m.” Dọba nkata ahụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, kpọọkwa isiala nye ya nʼebe ahụ. 11Mgbe ahụ, gị na ndị Livayị, na ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, ga-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọma niile Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị na ezinaụlọ gị. 12Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha. 13Ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Esitela m nʼụlọ wepụ oke ahụ dị nsọ, nye ha ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, dịka i nyere m nʼiwu, enupughị m isi maọbụ chefuo iwu gị ọbụla. 14Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.