Diuteronomi 23:3
Deuteronomy 23:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha.
Deuteronomy 23:3 in English
Deuteronomy 23:3 · Berean Standard Bible
No Ammonite or Moabite or any of their descendants may enter the assembly of the LORD, even to the tenth generation.
Context
1Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị. 2Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị. 3Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha. 4Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ. 5Ma Onyenwe anyị Chineke gị egeghị Belam ntị, kama Onyenwe anyị Chineke gị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọrọ gị ngọzị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị hụrụ gị nʼanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.