Native Bible

Deuteronomy 22:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na ị maghị onye nwe ya, maọbụ na nwanna gị ebighị nso, were ya laa nʼụlọ gị, hapụ ya nʼebe ahụ tutu onye nwe ya achọwa ya, mgbe ahụ ka ị ga-ewere ya nyeghachi ya.

Deuteronomy 22:2 in English

Deuteronomy 22:2 · Berean Standard Bible

If your brother does not live near you, or if you do not know who he is, you are to take the animal home to remain with you until your brother comes seeking it; then you can return it to him.

Context

1Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ atụrụ nwanna gị ka ọ na-akpafu, emela dịka a ga-asị na ị hụghị ya, jide ya, kpụlaara ya onye nwe ya. 2Ọ bụrụ na ị maghị onye nwe ya, maọbụ na nwanna gị ebighị nso, were ya laa nʼụlọ gị, hapụ ya nʼebe ahụ tutu onye nwe ya achọwa ya, mgbe ahụ ka ị ga-ewere ya nyeghachi ya. 3Otu a kwa ka ị ga-eme ma ị hụ ịnyịnya ibu nwanna gị, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla ị ga-atụtụta. Were ya debere onye nwe ya. 4Ọ bụrụ na ị hụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi nwanna gị ka ha dara nʼụzọ, elela anya nʼebe ọzọ, gaa nyere ya aka bulie ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.