Native Bible

Deuteronomy 21:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị, kpuchiere ndị gị Izrel mmehie ha, bụ ndị gị ị gbapụtara. Agụla ndị gị dịka ndị ikpe mara nʼihi ọnwụ nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ.” Otu a ka a ga-esi kpuchie mmehie nʼihi mwụfu ọbara ahụ.

Deuteronomy 21:8 in English

Deuteronomy 21:8 · Berean Standard Bible

Accept this atonement, O LORD, for Your people Israel whom You have redeemed, and do not hold the shedding of innocent blood against them.” And the bloodshed will be atoned for.

Context

6Mgbe ahụ, ndị okenye niile nke obodo ndị ahụ dịkarịsịrị ozu ahụ nso, ga-akwọ aka ha nʼelu nwaagbọghọ ehi ahụ,* nke ahụ a gbajiri olu nʼime ndagwurugwu ahụ. 7Ha ga-ekwupụta sị, “Aka anyị dị ọcha, ọ bụghị anyị gburu nwoke a, anyị amakwaghị onye gburu ya. 8Onyenwe anyị, kpuchiere ndị gị Izrel mmehie ha, bụ ndị gị ị gbapụtara. Agụla ndị gị dịka ndị ikpe mara nʼihi ọnwụ nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ.” Otu a ka a ga-esi kpuchie mmehie nʼihi mwụfu ọbara ahụ. 9Nʼụzọ dị otu a, ka ị ga-esi wezugara onwe gị ikpe ọmụma gaara abụ nke gị nʼihi ọbara onye ahụ nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na i meela ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. 10Mgbe ị pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka i merie ndị iro gị, dọta ụfọdụ nʼime ha nʼagha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.