Diuteronomi 21:5
Deuteronomy 21:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha Onyenwe anyị, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ.
Deuteronomy 21:5 in English
Deuteronomy 21:5 · Berean Standard Bible
And the priests, the sons of Levi, shall come forward, for the LORD your God has chosen them to serve Him and pronounce blessings in His name and to give a ruling in every dispute and case of assault.
Context
3Ndị okenye obodo ahụ ga-ewere nwa nne ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ, maọbụ nyara yoku ọbụla 4ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ. 5Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha Onyenwe anyị, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ. 6Mgbe ahụ, ndị okenye niile nke obodo ndị ahụ dịkarịsịrị ozu ahụ nso, ga-akwọ aka ha nʼelu nwaagbọghọ ehi ahụ,* nke ahụ a gbajiri olu nʼime ndagwurugwu ahụ. 7Ha ga-ekwupụta sị, “Aka anyị dị ọcha, ọ bụghị anyị gburu nwoke a, anyị amakwaghị onye gburu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.