Diuteronomi 20:3
Deuteronomy 20:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Geenụ ntị, unu ndị Izrel, taa, unu na-apụ ibuso ndị iro unu agha. Unu atụla egwu. Unu atụla ụjọ. Ka obi unu gharakwa ịda mba.
Deuteronomy 20:3 in English
Deuteronomy 20:3 · Berean Standard Bible
saying to them, “Hear, O Israel, today you are going into battle with your enemies. Do not be fainthearted or afraid; do not be alarmed or terrified because of them.
Context
1Mgbe i pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na i lee anya hụ na ndị iro gị nwere ọtụtụ ịnyịnya, ụgbọ agha na ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa gị, unu atụla egwu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị, onye ahụ mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼudo, nọnyeere gị. 2Tupu agha ebido, otu onye nchụaja ga-eguzo nʼihu ndị agha Izrel gwa ha okwu sị, 3“Geenụ ntị, unu ndị Izrel, taa, unu na-apụ ibuso ndị iro unu agha. Unu atụla egwu. Unu atụla ụjọ. Ka obi unu gharakwa ịda mba. 4Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-eso unu gaa, ọ ga-alụrụ unu ọgụ imegide ndị iro unu, ọ ga-enyekwa unu mmeri.” 5Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.