Diuteronomi 2:36
Deuteronomy 2:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị.
Deuteronomy 2:36 in English
Deuteronomy 2:36 · Berean Standard Bible
From Aroer on the rim of the Arnon Valley, along with the city in the valley, even as far as Gilead, not one city had walls too high for us. The LORD our God gave us all of them.
Context
34Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ. 35Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata. 36Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị. 37Ma dịka usoro iwu Onyenwe anyị Chineke anyị si dị, anyị abanyeghị ala ndị Amọn ọbụla maọbụ ruokwa nʼala dị nʼakụkụ iyi Jabọk nso, maọbụ nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼugwu.
2:5 Ndị Edọm, ndị Moab na ndị Amọn nwere ka ha si bụrụ ụmụnna ndị Izrel. Chineke nyere ha ala nke aka ha, Jen 36:6-8; Jos 24:4
2:8 Ụmụ Ịsọ Ha kwesiri ịkpọ ndị Edọm ụmụnna ha, nʼihi na nna nna ha bụ Ịsọ bụ nwanne Jekọb. Jen 25:24-26; Jos 24:4
2:20 Jen 15:5
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.