Native Bible

Deuteronomy 2:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz,

Deuteronomy 2:32 in English

Deuteronomy 2:32 · Berean Standard Bible

So Sihon and his whole army came out for battle against us at Jahaz.

Context

30Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a. 31Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.” 32Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz, 33Onyenwe anyị Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile. 34Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.