Native Bible

Deuteronomy 19:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu.

Deuteronomy 19:6 in English

Deuteronomy 19:6 · Berean Standard Bible

Otherwise, the avenger of blood might pursue the manslayer in a rage, overtake him if the distance is great, and strike him dead though he did not deserve to die, since he did not intend any harm.

Context

4Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya. 5Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya. 6Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu. 7Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ. 8Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.