Native Bible

Deuteronomy 19:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ.

Deuteronomy 19:3 in English

Deuteronomy 19:3 · Berean Standard Bible

You are to build roads for yourselves * and divide into three regions the land that the LORD your God is giving you as an inheritance, so that any manslayer can flee to these cities.

Context

1Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile, 2mgbe ahụ, kewapụta* obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche. 3Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ. 4Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya. 5Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.