Diuteronomi 19:17
Deuteronomy 19:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ.
Deuteronomy 19:17 in English
Deuteronomy 19:17 · Berean Standard Bible
both parties to the dispute must stand in the presence of the LORD, before the priests and judges who are in office at that time.
Context
15Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe. 16Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha, 17a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ. 18Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha, 19ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.