Diuteronomi 19:14
Deuteronomy 19:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta.
Deuteronomy 19:14 in English
Deuteronomy 19:14 · Berean Standard Bible
You must not move your neighbor’s boundary marker, which was set up by your ancestors to mark the inheritance you shall receive in the land that the LORD your God is giving you to possess.
Context
12ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya. 13Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma. 14Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta. 15Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe. 16Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.