Native Bible

Deuteronomy 19:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a,

Deuteronomy 19:11 in English

Deuteronomy 19:11 · Berean Standard Bible

If, however, a man hates his neighbor and lies in wait, attacks him and kills him, and then flees to one of these cities,

Context

9nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ. 10Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa. 11Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a, 12ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya. 13Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.