Diuteronomi 18:19
Deuteronomy 18:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike.
Deuteronomy 18:19 in English
Deuteronomy 18:19 · Berean Standard Bible
And I will hold accountable anyone who does not listen to My words that the prophet speaks in My name.*
Context
17Nʼihi ya, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma. 18Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha. 19Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike. 20Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.” 21I nwere ike ikwu nʼobi gị sị, “Olee otu anyị ga-esi mata na okwu e kwuru si nʼaka Onyenwe anyị nʼezie?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.