Diuteronomi 16:5
Deuteronomy 16:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị gaghị achụ aja ngabiga nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị,
Deuteronomy 16:5 in English
Deuteronomy 16:5 · Berean Standard Bible
You are not to sacrifice the Passover animal in any of the towns that the LORD your God is giving you.
Context
3Erila ya na achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee, kama ụbọchị asaa ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, ya bụ, achịcha ahụhụ, iji cheta na i si nʼala Ijipt pụta ngwangwa. Nke a ga-eme ka i nwee ike na-echeta mgbe i sitere nʼala Ijipt pụta, ụbọchị niile nke ndụ. 4Ka ihe ọbụla na-eko achịcha ghara ịbata nʼezinaụlọ gị abalị asaa ndị ahụ. Unu ahapụkwala anụ ọbụla unu chụrụ nʼaja nʼoge uhuruchi nke ụbọchị mbụ, nọọ ruo ụtụtụ. 5Ị gaghị achụ aja ngabiga nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị, 6karịakwa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara dịka ebe obibi nye ya ka i ga-anọ chụọ ya. Nʼebe ahụ ka ị ga-achụ aja ngabiga gị nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dachara, nʼoge mgbe dịka oge ụbọchị ahụ i sitere nʼIjipt pụta. 7Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.