Diuteronomi 16:2
Deuteronomy 16:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-eji anụ si nʼigwe atụrụ na ehi gị chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja ngabiga nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta dịka ebe obibi nye aha ya.
Deuteronomy 16:2 in English
Deuteronomy 16:2 · Berean Standard Bible
You are to offer to the LORD your God the Passover sacrifice from the herd or flock in the place the LORD will choose as a dwelling for His Name.
Context
1Debe ọnwa Abib* iche maka ime Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa Abib ka Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼabalị. 2Ị ga-eji anụ si nʼigwe atụrụ na ehi gị chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja ngabiga nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta dịka ebe obibi nye aha ya. 3Erila ya na achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee, kama ụbọchị asaa ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, ya bụ, achịcha ahụhụ, iji cheta na i si nʼala Ijipt pụta ngwangwa. Nke a ga-eme ka i nwee ike na-echeta mgbe i sitere nʼala Ijipt pụta, ụbọchị niile nke ndụ. 4Ka ihe ọbụla na-eko achịcha ghara ịbata nʼezinaụlọ gị abalị asaa ndị ahụ. Unu ahapụkwala anụ ọbụla unu chụrụ nʼaja nʼoge uhuruchi nke ụbọchị mbụ, nọọ ruo ụtụtụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.