Native Bible

Deuteronomy 15:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya,

Deuteronomy 15:7 in English

Deuteronomy 15:7 · Berean Standard Bible

If there is a poor man among your brothers within any of the gates in the land that the LORD your God is giving you, then you are not to harden * your heart or shut your hand from your poor brother.

Context

5ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa. 6Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị. 7Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya, 8ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ. 9Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.