Native Bible

Deuteronomy 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na ohu gị asị gị, “Achọghị m ịhapụ gị,” nʼihi na ọ hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ.

Deuteronomy 15:16 in English

Deuteronomy 15:16 · Berean Standard Bible

But if your servant says to you, ‘I do not want to leave you,’ because he loves you and your household and is well off with you,

Context

14Ị ga-esite nʼigwe anụ ụlọ gị, na nʼebe ịzọcha ọka gị, na nʼebe ịzọcha vaịnị gị, nye ya onyinye pụrụ iche iji sị ya laa nʼudo. Nye ya onyinye a dịka Onyenwe anyị Chineke gị si gọzie gị. 15Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt ma Onyenwe anyị bụ Chineke gị gbapụtara gị. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a taa. 16Ma ọ bụrụ na ohu gị asị gị, “Achọghị m ịhapụ gị,” nʼihi na ọ hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ. 17Were agịga kpọpuo ntị* ya nʼọnụ ụzọ ụlọ gị. Ọ ga-abụkwara gị ohu ogologo ndụ ya niile. Otu aka ahụ kwa ka ị ga-eme ohu gị nwanyị. 18Enwela obi mwute mgbe ọbụla ị na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ị ga-echeta na ọ rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe ị gaara eji goo ndị ọrụ. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile ị na-eme.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.