Native Bible

Deuteronomy 13:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ.

Deuteronomy 13:16 in English

Deuteronomy 13:16 · Berean Standard Bible

And you are to gather all its plunder in the middle of the public square, and completely burn the city and all its plunder as a whole burnt offering to the LORD your God. The city must remain a mound of ruins forever, never to be rebuilt.

Context

14tupu i mee ihe ọbụla, ị ga-eburu ụzọ jụọ ase, jụpụta nke ọma, ma nyochapụta ma okwu ahụ ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na-achọpụtakwara nʼihe arụ dị otu a mere nʼetiti unu, 15ị ghaghị ibuso obodo ahụ agha jiri mma agha gbuo ndị mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ. Ị ghaghị ibibi ya kpamkpam, ma ndị mmadụ ma anụ ụlọ ha. 16Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ. 17Ọ dịghị ihe ndị ahụ e debere nye mbibi nke e kwesiri ịhụ nʼaka gị. Nke a ga-emekwa ka iwe ọkụ Onyenwe anyị dajụọ, ka o gosikwa gị obi ebere. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ gị, meekwa ka ị baa ụba nʼọnụọgụgụ, dịka o ji ịṅụ iyi kwee nna nna gị ha na nkwa. 18Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, na-edebezukwa iwu ya niile, nke m na-enye gị taa, ma na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị. 13:1 Maọbụ, ikpere arụsị

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.