Diuteronomi 13:10
Deuteronomy 13:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jiri nkume tugbuo ya, nʼihi na ọ chọrọ ime ka i site nʼiso Onyenwe anyị Chineke, wezuga onwe gị, ka ị pụọ, ma chigharịa site nʼiso ya, bụ Onyenwe anyị, onye mere ka i site nʼala Ijipt pụta, ala ebe ị nọ nʼime ya dịka ohu.
Deuteronomy 13:10 in English
Deuteronomy 13:10 · Berean Standard Bible
Stone him to death for trying to turn you away from the LORD your God, who brought you out of the land of Egypt, out of the house of slavery.
Context
8ekwenyekwala maọbụ ṅaa ntị nʼihe ọ na-ekwu. Enwekwala obi ebere nʼebe ọ nọ, ekpuchikwala atụmatụ ọjọọ ya niile. 9Ị ghaghị igbu ha. Buru ụzọ setịpụ aka gị tụọ ya nkume, ka ndị ọzọ soro gị tugbuo ya. 10Jiri nkume tugbuo ya, nʼihi na ọ chọrọ ime ka i site nʼiso Onyenwe anyị Chineke, wezuga onwe gị, ka ị pụọ, ma chigharịa site nʼiso ya, bụ Onyenwe anyị, onye mere ka i site nʼala Ijipt pụta, ala ebe ị nọ nʼime ya dịka ohu. 11Izrel niile ga-anụkwa banyere ihe ọjọọ o mere, ha ga-atụkwa ihe ọjọọ dị otu a egwu, ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti gị ga-achọkwa ime ihe ọjọọ dị otu ahụ. 12Mgbe i bi nʼobodo ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, ọ bụrụ na akụkọ esite nʼotu obodo ndị a ruo gị ntị sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.