Diuteronomi 12:9
Deuteronomy 12:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu.
Deuteronomy 12:9 in English
Deuteronomy 12:9 · Berean Standard Bible
For you have not yet come to the resting place and the inheritance that the LORD your God is giving you.
Context
7Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu gọziri unu. 8Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya, 9nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. 10Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe Onyenwe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ. 11Mgbe ahụ, unu ga-eweta ihe ndị ahụ niile m nyere unu nʼiwu: aja nsure ọkụ unu niile, na aja ndị ọzọ, na onyinye ahụ pụrụ iche unu kwere nkwa inye, unu ga-eweta ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu họpụtara ebe o kpọkwasịrị aha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.