Native Bible

Deuteronomy 12:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka unu ga-ewetara Onyenwe anyị aja nsure ọkụ unu, na aja ndị ọzọ niile, na otu ụzọ nʼụzọ iri unu, na onyinye pụrụ iche unu, bụ onyinye unu kwere nkwa inye, na onyinye afọ ofufu unu, na onyinye ụmụ mbụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ unu.

Deuteronomy 12:6 in English

Deuteronomy 12:6 · Berean Standard Bible

To that place you are to bring your burnt offerings and sacrifices, your tithes and heave offerings, your vow offerings and freewill offerings, as well as the firstborn of your herds and flocks.

Context

4Unu agaghị efe Onyenwe anyị Chineke unu ofufe dịka ndị ahụ na-efe arụsị na-eme. 5Kama unu chọpụta ebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, site nʼetiti ebo Izrel niile, ebe ọ ga-akpọkwasị aha ya. Nʼebe ahụ ka unu ga-abịakwute ya. 6Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka unu ga-ewetara Onyenwe anyị aja nsure ọkụ unu, na aja ndị ọzọ niile, na otu ụzọ nʼụzọ iri unu, na onyinye pụrụ iche unu, bụ onyinye unu kwere nkwa inye, na onyinye afọ ofufu unu, na onyinye ụmụ mbụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ unu. 7Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu gọziri unu. 8Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.