Native Bible

Deuteronomy 12:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lezienụ anya hụ na unu na-eme ihe niile bụ nke m nyere unu nʼiwu. Unu etinyela ihe nʼime ya maọbụ wepụkwa ihe site na ya.

Deuteronomy 12:32 in English

Deuteronomy 12:32 · Berean Standard Bible

See that you do everything I command you; do not add to it or subtract from it.

Context

30Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.” 31Efekwala Onyenwe anyị bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja. 32Lezienụ anya hụ na unu na-eme ihe niile bụ nke m nyere unu nʼiwu. Unu etinyela ihe nʼime ya maọbụ wepụkwa ihe site na ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.