Native Bible

Deuteronomy 12:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe.

Deuteronomy 12:2 in English

Deuteronomy 12:2 · Berean Standard Bible

Destroy completely all the places where the nations you are dispossessing have served their gods—atop the high mountains, on the hills, and under every green tree.

Context

1Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ niile unu na-aghaghị idebe ogologo ụbọchị niile unu ga-ebi nʼala ahụ, Onyenwe anyị Chineke nna unu ha nyere unu, dịka ihe nweta. 2Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe. 3Kwatuokwanụ ebe ịchụ aja ha niile, tijisie ogidi nsọ ha niile, kpọọkwa osisi Ashera ha ọkụ, gbutukwaanụ arụsị niile a apịrị apị nke chi niile ha. Kpochapụkwanụ aha ha niile site nʼebe niile ahụ. 4Unu agaghị efe Onyenwe anyị Chineke unu ofufe dịka ndị ahụ na-efe arụsị na-eme.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.