Native Bible

Deuteronomy 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ nke a mere ndị Livayị enweghị oke maọbụ ihe nketa nʼetiti ndị Izrel ibe ha; Onyenwe anyị bụ ihe nketa ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu gwara ha.)

Deuteronomy 10:9 in English

Deuteronomy 10:9 · Berean Standard Bible

That is why Levi has no portion or inheritance among his brothers; the LORD is his inheritance, as the LORD your God promised him.

Context

7Site nʼebe ahụ, ha gagidere ije ruo Gudgoda, sitekwa na ya ruo Jotbata, ala nke iyi na-asọ asọ juru nʼime ya. 8Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị kewapụtara ebo Livayị ibu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na iguzo nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi na ikwupụta ngọzị nʼaha ya, dịka ha sị eme ruo taa. 9Ọ bụ nke a mere ndị Livayị enweghị oke maọbụ ihe nketa nʼetiti ndị Izrel ibe ha; Onyenwe anyị bụ ihe nketa ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu gwara ha.) 10Ugbu a, anọọla m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, dịka m mere nʼoge mbụ, Onyenwe anyị gekwara m ntị nʼoge ugbu a. Ọ bụghị ọchịchọ Onyenwe anyị ibibi unu. 11Onyenwe anyị gwara m, “Bilie, gaa ka i duru ndị a gaa na njem ha, ka ha banye, ma nwetakwa ala ahụ nke m kwere nna nna ha na nkwa inye ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.