Diuteronomi 10:6
Deuteronomy 10:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
(Ụmụ Izrel gara ije site nʼolulu mmiri nke Bene Jaakan garuo Mosera, nʼebe ahụ ka Erọn nọ nwụọ, e lie ya nʼebe ahụ. Elieza, bụ ọkpara ya nọchiri ọnọdụ ya dịka onye nchụaja.
Deuteronomy 10:6 in English
Deuteronomy 10:6 · Berean Standard Bible
The Israelites traveled from Beeroth Bene-jaakan * to Moserah, where Aaron died and was buried, and Eleazar his son succeeded him as priest.
Context
4Onyenwe anyị dere nʼelu mbadamba nkume ahụ ihe ndị ahụ o dere na mbụ, bụ iwu iri ndị ahụ o gwara unu nʼelu ugwu site nʼime ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ. Onyenwe anyị nyekwara m ha. 5Mgbe m si nʼugwu ahụ rịdata, etinyere m mbadamba nkume abụọ ahụ nʼime igbe ahụ m kwara, dịka Onyenwe anyị nyere m nʼiwu. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. 6(Ụmụ Izrel gara ije site nʼolulu mmiri nke Bene Jaakan garuo Mosera, nʼebe ahụ ka Erọn nọ nwụọ, e lie ya nʼebe ahụ. Elieza, bụ ọkpara ya nọchiri ọnọdụ ya dịka onye nchụaja. 7Site nʼebe ahụ, ha gagidere ije ruo Gudgoda, sitekwa na ya ruo Jotbata, ala nke iyi na-asọ asọ juru nʼime ya. 8Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị kewapụtara ebo Livayị ibu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na iguzo nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi na ikwupụta ngọzị nʼaha ya, dịka ha sị eme ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.