Diuteronomi 10:3
Deuteronomy 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, eji m osisi akashia kwaa igbe ahụ. A wapụtakwara m mbadamba nkume abụọ yiri ndị nke mbụ, were ha rigoro ugwu ahụ.
Deuteronomy 10:3 in English
Deuteronomy 10:3 · Berean Standard Bible
So I made an ark of acacia wood, chiseled out two stone tablets like the originals, and went up the mountain with the two tablets in my hands.
Context
1Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara m, sị, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, were ha bịakwute m nʼelu ugwu. Ọzọ, wuokwara onwe gị igbe osisi. 2Aga m edekwasị nʼelu mbadamba nkume ndị a, okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ, bụ nke ị tụpịasịrị. Ị ga-etinyekwa ha nʼime igbe ahụ.” 3Ya mere, eji m osisi akashia kwaa igbe ahụ. A wapụtakwara m mbadamba nkume abụọ yiri ndị nke mbụ, were ha rigoro ugwu ahụ. 4Onyenwe anyị dere nʼelu mbadamba nkume ahụ ihe ndị ahụ o dere na mbụ, bụ iwu iri ndị ahụ o gwara unu nʼelu ugwu site nʼime ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ. Onyenwe anyị nyekwara m ha. 5Mgbe m si nʼugwu ahụ rịdata, etinyere m mbadamba nkume abụọ ahụ nʼime igbe ahụ m kwara, dịka Onyenwe anyị nyere m nʼiwu. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.