Diuteronomi 1:8
Deuteronomy 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.”
Deuteronomy 1:8 in English
Deuteronomy 1:8 · Berean Standard Bible
See, I have placed the land before you. Enter and possess the land that the LORD swore He would give to your fathers Abraham, Isaac, and Jacob, and to their descendants after them.”
Context
6Onyenwe anyị Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a. 7Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis. 8Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.” 9Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m. 10Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.