Diuteronomi 1:23
Deuteronomy 1:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla.*
Deuteronomy 1:23 in English
Deuteronomy 1:23 · Berean Standard Bible
The plan seemed good to me, so I selected twelve men from among you, one from each tribe.
Context
21Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”* 22Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.” 23Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla.* 24Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ. 25Ha ghọtara ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi mịrị nʼala ahụ, bulatara anyị. Ha wetakwaara anyị ozi, sị, “Ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-aga inye anyị dị mma.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.