Native Bible

Deuteronomy 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa.

Deuteronomy 1:11 in English

Deuteronomy 1:11 · Berean Standard Bible

May the LORD, the God of your fathers, increase you a thousand times over and bless you as He has promised.

Context

9Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m. 10Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. 11Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa. 12Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile? 13Họpụtanụ ụfọdụ ndị ikom nwe amamihe, nghọta, na ndị a na-akwanyere ụgwụ, site nʼebo niile unu nʼotu nʼotu, aga m emekwa ha ndịisi unu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.