Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼafọ mbụ nke ọchịchị ya, ka mụ onwe m, bụ Daniel ghọtara site nʼakwụkwọ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Jeremaya onye amụma, nke ga-emezu mgbe Jerusalem ga-anọ na mbibi iri afọ asaa.

Daniel 9:2 in English

Daniel 9:2 · Berean Standard Bible

in the first year of his reign, I, Daniel, understood from the sacred books, according to the word of the LORD to Jeremiah the prophet, that the desolation of Jerusalem would last seventy years.*

Context

1Nʼafọ mbụ, nke Daraiọs nwa Ahasuerọs (onye agbụrụ Midia), onye e mere eze nke alaeze ndị Kaldịa, 2nʼafọ mbụ nke ọchịchị ya, ka mụ onwe m, bụ Daniel ghọtara site nʼakwụkwọ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Jeremaya onye amụma, nke ga-emezu mgbe Jerusalem ga-anọ na mbibi iri afọ asaa. 3Nʼihi nke a, echere m Onyenwe anyị Chineke ihu, rịọ ya arịrịọ, site nʼekpere na arịrịọ amara, nʼibu ọnụ, na iyikwa akwa mkpe na ntụ. 4Ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị bụ Chineke m, ma kwupụta sị, “Onyenwe anyị, onye dị ukwuu, dị oke egwu. Onye na-edebe ọgbụgba ndụ nke ịhụnanya nke ndị hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.