Daniel 9:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, onye ji aka dị ike kpọpụta ndị nke ya nʼala Ijipt, i meere onwe gị aha nke na-adịgide ruo taa. Anyị mere mmehie, ma mejọọkwa.
Daniel 9:15 in English
Daniel 9:15 · Berean Standard Bible
Now, O Lord our God, who brought Your people out of the land of Egypt with a mighty hand, and who made for Yourself a name renowned to this day, we have sinned; we have acted wickedly.
Context
13Ọ bụ dịka e si dee ya nʼiwu Mosis, ka mbibi a niile bịakwasịrị anyị, ma anyị achọbeghị ihuọma Onyenwe anyị Chineke anyị, na ichegharị site na mmehie anyị chee uche banyere eziokwu gị. 14Onyenwe anyị kpachara anya mee ka nsogbu a bịakwasị anyị. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke anyị, bụ onye ezi omume nʼihe niile ọ na-eme, ma anyị jụrụ irubere ya isi. 15“Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, onye ji aka dị ike kpọpụta ndị nke ya nʼala Ijipt, i meere onwe gị aha nke na-adịgide ruo taa. Anyị mere mmehie, ma mejọọkwa. 16Onyenwe anyị, dịka ezi omume gị si dị, wezuga iwe gị na oke iwe gị nʼebe Jerusalem nọ, bụ obodo gị, na ugwu nsọ gị. Mmehie anyị na njehie nna anyị ha emeela ka Jerusalem na ndị gị bụrụ ihe ịkwa emo nye ndị gbara anyị gburugburu. 17“Ma ugbu a, Chineke anyị, biko nụrụ ekpere na arịrịọ ohu gị. Nʼihi aha gị, Onyenwe anyị jiri amara mee ka ihe si nʼihu gị mụkwasị ụlọnsọ gị nke tọgbọrọ nʼefu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.