Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Izrel niile enupula isi nʼiwu gị, wezuga onwe ha, jụ ige gị ntị. “Ya mere, ọbụbụ ọnụ ahụ niile e dere nʼiwu Mosis, odibo nke Chineke adakwasịla anyị, nʼihi na anyị emehiela megide gị.

Daniel 9:11 in English

Daniel 9:11 · Berean Standard Bible

All Israel has transgressed Your law and turned away, refusing to obey Your voice; so the oath and the curse written in the Law of Moses the servant of God has been poured out on us, because we have sinned against You.

Context

9Ma Onyenwe anyị Chineke anyị ka obi ebere na mgbaghara niile dịrị, nʼihi na anyị enupurula gị isi. 10Anyị erubeghị isi nye Onyenwe anyị Chineke anyị, maọbụ debe iwu ahụ o nyere anyị site nʼaka ndị ohu ha bụ ndị amụma. 11Ndị Izrel niile enupula isi nʼiwu gị, wezuga onwe ha, jụ ige gị ntị. “Ya mere, ọbụbụ ọnụ ahụ niile e dere nʼiwu Mosis, odibo nke Chineke adakwasịla anyị, nʼihi na anyị emehiela megide gị. 12O meela ka okwu ya guzosie ike, bụ nke o kwuru megide anyị na ndị ndu anyị site nʼiwetara anyị oke mbibi a. Nke bụ na o nwebeghị mgbe ọbụla e merela ụdị ihe emere na Jerusalem nʼokpuru eluigwe. 13Ọ bụ dịka e si dee ya nʼiwu Mosis, ka mbibi a niile bịakwasịrị anyị, ma anyị achọbeghị ihuọma Onyenwe anyị Chineke anyị, na ichegharị site na mmehie anyị chee uche banyere eziokwu gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.