Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọhụ a ị hụrụ, maka ụtụtụ na anyasị nke ekpughere gị bụ eziokwu, ma zobe ọhụ a, nʼihi na ọ dịrị ọtụtụ oge ka dị nʼihu.”

Daniel 8:26 in English

Daniel 8:26 · Berean Standard Bible

The vision of the evenings and the mornings that has been spoken is true. Now you must seal up the vision, for it concerns the distant future.”

Context

24Ọ ga-adị ike nke ukwuu, ma ọ bụghị nʼike onwe ya, ọ ga-eweta mbibi ga-eju anya. Ihe niile o metụrụ aka ga-agara ya nke ọma. Ọ ga-alakwa ndị dị ike na ndị nsọ nʼiyi. 25Ọ ga-eme ka aghụghọ baa ụba, ọ ga-ahụta onwe ya dịka onye dị elu karịa, mgbe ndị mmadụ na-eche na udo dị, ọ ga-ebibi ọtụtụ ndị. Ọ ga-eguzo megide Onyeisi nke ndịisi, a ga-ebibi ya ma ọ bụghị nʼike nke mmadụ. 26“Ọhụ a ị hụrụ, maka ụtụtụ na anyasị nke ekpughere gị bụ eziokwu, ma zobe ọhụ a, nʼihi na ọ dịrị ọtụtụ oge ka dị nʼihu.” 27Mụ bụ Daniel, nọrọ nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ na ahụ esighị ike. Mgbe ụbọchị ole na ole gafekwara, ebiliri m bidokwa na-agagharị, na-arụkwa ọrụ eze, ma obi jọrọ m njọ nke ukwuu nʼihi nrọ ahụ, nʼihi na ọ karịrị m nghọta. 8:12 Maọbụ, ndị agha

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.