Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka.

Daniel 8:19 in English

Daniel 8:19 · Berean Standard Bible

and said, “Behold, I will make known to you what will happen in the latter time of wrath, because it concerns the appointed time of the end.

Context

17Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.” 18Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m. 19Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka. 20Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa. 21Mkpi ahụ ị hụrụ na-egosi eze ndị Griis, nnukwu mpi nke dị nʼetiti anya ya abụọ bụ eze nke mbụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.