Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.”

Daniel 8:16 in English

Daniel 8:16 · Berean Standard Bible

And I heard the voice of a man calling from between the banks of the Ulai: “Gabriel, explain the vision to this man.”

Context

14Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.” 15Mgbe mụ bụ Daniel nọ na-ele ọhụ ahụ na-achọkwa ịghọta ya, o nwere otu onye dịka nwoke bịara guzo nʼihu m. 16Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.” 17Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.” 18Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.