Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri.

Daniel 7:2 in English

Daniel 7:2 · Berean Standard Bible

Daniel declared: “In my vision in the night I looked, and suddenly the four winds of heaven were churning up the great sea.*

Context

1Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ. 2“Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri. 3Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya. 4“Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.