Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ.

Daniel 7:11 in English

Daniel 7:11 · Berean Standard Bible

Then I kept watching because of the arrogant words the horn was speaking. As I continued to watch, the beast was slain, and its body was destroyed and thrown into the blazing fire.

Context

9“Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. 10Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche. 11“Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ. 12(Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge). 13“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.